mbido igbo

4.2K posts

mbido igbo banner
mbido igbo

mbido igbo

@mbidoigbo

Ịkwado Agụụ Mmụta Asụsụ na Omenala Igbo. WhatsApp Link: https://t.co/xff62GkT34

Onitsha, Nigeria Katılım Temmuz 2016
82 Takip Edilen16.3K Takipçiler
Sabitlenmiş Tweet
mbido igbo
mbido igbo@mbidoigbo·
Taa bụ ụbọchị ncheta ọmụmụ @GenevieveNnaji1 na @alexiwobi Ekpere anyị bụ ka ogologo ndụ, ahụike na amara Chineke bara ha ụba. Ha ga na-eje eje, na-abatakwa abata. Ọzọ, ha ga na-eketa oke ha n'ụbọchị Eke, Orie, Afọ na Nkwọ. Ya gazie. 🍷🥂🍻🎂🥃🍾🎵🎶🍰
mbido igbo tweet mediambido igbo tweet media
Tiếng Việt
260
566
4.7K
302.1K
mbido igbo
mbido igbo@mbidoigbo·
Taa bụ ụbọchị ncheta a mụrụ @GenevieveNnaji1 na @alexiwobi Ekpere anyị bụ ka ogologo ndụ, ahụike na amara Chineke bara ha ụba. Ha ga na-eje eje, na-abatakwa abata. Ọzọ, ha ga na-eketa oke ha n'ụbọchị Eke, Orie, Afọ na Nkwọ. Ya gazie. 🍷🥂🍻🎂🥃🍾🎵🎶🍰
mbido igbo tweet mediambido igbo tweet media
Tiếng Việt
0
0
9
164
mbido igbo
mbido igbo@mbidoigbo·
Oke zutere azụ nye Ugomma. Ugomma nara ya azụ ahụ taa. Ọ jụghị ase ebe ọ siri weta maka ụsa ekweghị ya jụọ ajụjụ. Ma ọ maghị na o nwere onye hụrụ ya ka ọ na-ada iwu Eze tiri. 😾🐀🦁 #aianimation
Tiếng Việt
0
0
2
88
mbido igbo
mbido igbo@mbidoigbo·
Onye aghụghọ nwụọ, onye aghụghọ e lie ya.
mbido igbo tweet mediambido igbo tweet mediambido igbo tweet mediambido igbo tweet media
Tiếng Việt
0
0
2
46
mbido igbo
mbido igbo@mbidoigbo·
Ncheta Ụbọchị A Mụrụ Chidịmma Ekile Taa bụ ụbọchị ncheta a mụrụ Chidịmma Ekile. Ekpere anyị bụ ka Chi Ukwu were amara, ngọzi, ogologo ndụ na ahụike chọọ ya mma. Ebe ọ wepụtakwara onwe ya ife ya ofufe, ka ọ ghara isi n'okwukwe ya dapụ. Ọrịa ọ bụla agaghị ahụ ya. Ndị ajọ mmụọ, ajọ mmadụ na ndị ama agaghị ahụkwa ya ma ọlị. Ya gazie 🎊🥂🎉
mbido igbo tweet mediambido igbo tweet media
Tiếng Việt
0
0
10
118
mbido igbo
mbido igbo@mbidoigbo·
Ahụ ekwughị na-egbu okenye. Ekwu anụghị na-egbu nwata. Ndị okenye na-ekwunu oooo. Ụmụaka biko ntị unu ghere oghe ịnụ, maka nka dị na ntị. Ya gazie 🧓 🧒
mbido igbo tweet mediambido igbo tweet media
Tiếng Việt
0
0
3
29
mbido igbo
mbido igbo@mbidoigbo·
Oke Na Nwa Eze Episode 3 Ọdụm nyere iwu na o nweghị onye ga-emetụ azụ ahụ aka ruo ụbọchị emume, ma ọ maghị n'ụfọdụ mgbe onye kaa onye ọzọ a kagharịa.🦁🐀 😾
Tiếng Việt
0
0
1
73
mbido igbo
mbido igbo@mbidoigbo·
Onye na-amụ iti ọkpọ Buru ụzọ tie akpa aja. I tichaa akpa aja. Ị wee chọwa onye ị ga-eti. Olive De Coque. Nke a bụ ndụmọdụ megide iwe ọkụ. Were nwayọ na-eso ihe ụwa. #tbthursday #aigenerated
mbido igbo tweet mediambido igbo tweet mediambido igbo tweet mediambido igbo tweet media
Tiếng Việt
0
0
3
63
mbido igbo
mbido igbo@mbidoigbo·
Diochi anaghị a kọchaa ihe ọ hụrụ n'elu nkwụ. Na-edebe ire gị duu. A bụla onye na-akọ ihe dum ọ hụrụ. Chetakwa, onye na-akọ oke akụkọ bụ onye na-agba ama. Ya gazie.
mbido igbo tweet media
Tiếng Việt
1
1
5
71
mbido igbo
mbido igbo@mbidoigbo·
Chi e foola Ụmụ Igbo, ọ kwa a gụghe ụzọ, a gụghe ọnụ. Ị nọ nkịtị? Biko, bilie ozigbo gaa gba mbọ. Nwa afọ Igbo anaghị anọ nkịtị. Maka ọ bụ ngana tọọ ute, agụụ ekpughe ya. Onye gbakwa bọọlụ, ọ rachaa oroma. Onye rụọ, o rie. Gbara ngana ọsọ, gaa gbaa mbọ. Nwaafọ Igbo anaghị abụ onye ngana. Ya gazie.
Tiếng Việt
1
1
6
57
mbido igbo
mbido igbo@mbidoigbo·
Ọdụm bụ eze ụmụ anụmanụ nwere obi ọcha. N'ihi nke a, ọ na-ekpe ikpe kwụ ọtọ. Ụmụ anụmanụ ndị ọ na-achị na-akwanyekwara ya ugwu, maka ugwu bụ nkwanye nkwanye. Aha ụmụ ya atọ bụ Adaeze, Nkemjika na Ugomma. Ha bụ ọla eji chọọ okpueze mma. 🪎 💎 🦁 🌟 👑
Tiếng Việt
0
2
8
67
mbido igbo
mbido igbo@mbidoigbo·
Ncheta Amaka Igwe N’ụbọchị taa n’afọ 2014 ka Amaka Igwe zara oku ọnwụ. Amaka gara mahadum Obafemi Awolowo, Ife, ebe ọ gụrụ “Education/Religion” ma nwetakwa nzere “M.SC”ya na mahadum Ibadan. Ọ lụrụ di n’afọ 1993 ma mụtakwa ụmụ atọ. Amaka gosiri ihe o ji bụrụ ọkaibe n’ihe nkiri homu vidio, oge ọ mepụtara ihe nkiri ndị a: Checkmate Fuji House of Commotion. Violated. Rattle Snake, wdg. Ka mkpụrụ obi ya na-ezu ike n'udo. Amen 🙏🏾
mbido igbo tweet media
Filipino
0
0
1
64
mbido igbo
mbido igbo@mbidoigbo·
Ncheta Ụbọchị A Mụrụ Oby Ezekwesịlị Taa bụ ụbọchị ncheta a mụrụ Oby Ezekwesịlị(@obyezeks) Anyị na-arịọ ka amara, ngọzi na ịhụnaya Chineke bara ya ụba. Ndị ajọ mmụọ na ajọ mmadụ agaghị akpọ ya ihu ma ọlị. Ọ ga na-eje eje na-abatakwa abata. Ọ ga-adịkwara ya na ezinaụlọ ya na mma. Ya gazie.🎊🥂🎵🎉
mbido igbo tweet mediambido igbo tweet media
Tiếng Việt
0
0
1
61
mbido igbo
mbido igbo@mbidoigbo·
🎼🎶🎵 Udeze nwanne m Ọ nụrụ be Udeze nwanne m Ọ nụrụ be N'ihe mere be anyị Nwoke tụrụ ime Akwụ chara n'ọmụ Ji e siri n'ite puo ome Ọ nụrụ be Udeze n'anyị a lawa, a lawa Ọ nụrụ be🎵🎶
Tiếng Việt
0
0
0
65
mbido igbo
mbido igbo@mbidoigbo·
Mbe ma na ọrịa ji nne ya aka ga-egbu ya marakwa na o nweghị ego ọ ga-eji kwa ya wee gaa sịara ụmụnna ya asị gawa njem. O chere na ọ naferela, chezọsịa na mbe abụọ zukọọ ahịa, uru anaghị adị ya. 🐢🌍😂
Tiếng Việt
0
1
3
47
mbido igbo
mbido igbo@mbidoigbo·
Ncheta Ụbọchị A Mụrụ John Mikel Obi Taa bụ ụbọchị ncheta a mụrụ John Mikel Obi. Ekpere anyị n'isi ya bụ ka ogologo ndụ, ahụike na amara Chineke bara ya ụba. Ndị ajọ mmụọ na ndị ajọ mmadụ agaghị ezute ya n'ụzọ. Uke agaghị ahụkwa ya n'ahịa Eke, Orie, Afọ na Nkwọ. Ya gazie 🎉🍾🎂🎶💥🍷🥂🍻
mbido igbo tweet mediambido igbo tweet media
Tiếng Việt
0
0
0
42
mbido igbo
mbido igbo@mbidoigbo·
Mbe nwa Anịga hụrụ na ọrịa ji nne ya aka ga-eri isi nne ya. Ọ makwa na akpa ya adịghị arọ ịkwa nne ya nke ọma. O wee buru akpa ya kpọkọ ụmụnna ya wee gwa ha na ọ ga-eje njem n'obodo dị anya. 🐢 🌍
Filipino
0
0
2
64
mbido igbo
mbido igbo@mbidoigbo·
Ncheta Ọkammụta Ọnụọra Nzekwu N'ụbọchị taa n'afọ 2017 ka Ọnụọra Nzekwu zara oku ọnwụ. Ọ bụ onye Ọnịcha ma bụrụkwa onye mgbasaozi rụrụ ọrụ oyibo ruo mgbe e mere ya onyeisi "News Agency of Nigeria." Ọkammụta Nzekwu deere akwụkwọ bụ ọkpọkọpị aha ya bụ "Eze Goes to School" nke ọtụtụ ụmụ akwụkwọ gụrụ n'oge gara aga. Ụfọdụ ka na-agụkwa ya ugbu a. Ka mkpụrụ obi ya na-ezu ike n'udo. Amen 🙏🏾
mbido igbo tweet mediambido igbo tweet media
Tiếng Việt
0
0
2
89
mbido igbo
mbido igbo@mbidoigbo·
Mbe na nne ya nọ na-ebi n'udo ma ka otu afọ gasịrị, nne ya dara n'ọrịa. Mbe makwa na nne ya nwụọ na ọ ga-akwa ya ma kwanyere ya ugwu ikpeazụ dịka omenala si dị. Mana akpa Mbe adịghị arọ, o wee nọrọ na mgbagharị.
Tiếng Việt
0
0
1
44
mbido igbo
mbido igbo@mbidoigbo·
Ụmụ anụmanụ chezọrọ ịnye Bingo nri. Bingo a kpachara anya chezọkwa ịche nche. Ụmụ anụmanụ were iwe chụpụ Bingo, ebe Bingo gakwuru dinta malite gosiwe ya ụzọ ọnya ya ga-esi were enwudo ụmụ anụmanụ. Ọ bụ ya mere nkịta ji biri n'ogige ụmụ mmadụ ruo taa.
Tiếng Việt
0
1
2
97
mbido igbo
mbido igbo@mbidoigbo·
Ncheta Dọkịta Emeka Chugbo N’ụbọchị taa n’afọ 2020 ka Emeka Chugbo zara oku ọnwụ. Ọ bụ ọrịa "Corona Virus" dọkịta a butere n'aka onye ọrịa ọ na-agwọ n'ụlọọgwụ ya dulara ya mmụọ. Ihe mere ọrịa ji hịa ahụ ịhapụ ya bụ maka o teela ya na ọrịa "Asthma" na-agbarị. Ọ nwụrụ na "Lagos University Teaching Hospital." Ọ gbakwara afọ iri isii oge ọ nwụrụ. Ka mkpụrụ obi ya na-ezu ike n'udo. Amen🙏🏾
mbido igbo tweet media
Tiếng Việt
0
0
1
134